-
Diuterọnọmi 5:7-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Ya enwela mgbe ị ga-enwe chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.+
8 “‘Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị+ ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ ihe dị n’ụwa ma ọ bụ ihe dị na mmiri ndị dị n’ụwa. 9 Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka e mee ka i fee ha ofufe,+ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ M na-ata ụmụ ndị kpọrọ m asị ahụhụ, na-atakwa ọgbọ ha nke atọ nakwa ọgbọ ha nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha.+ 10 Ma m na-egosi otu puku ọgbọ nke ndị hụrụ m n’anya ma na-edebe iwu m na m hụrụ ha n’anya.
-