-
Levitikọs 25:35, 36Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
35 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye, ya abụrụ na o nweghị ike igboro onwe ya mkpa,+ ị ga na-enye ya ihe na-akpa ya otú ị ga-emere onye mbịarambịa na onye ọbịa,+ ka nwanne gị soro gị dịrị ndụ. 36 Anala ya ọmụrụ nwa ma ọ bụ jiri ya kpaa ego.+ Tụọ egwu Chineke gị.+ Nwanne gị ga-esokwa gị dịrị ndụ.
-
-
Luk 6:34, 35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 Ọ bụrụkwa na ndị unu na-agbazinye ihe* bụ ndị unu na-atụ anya ka ha kwụghachi unu, olee oké ihe unu mere?+ Ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ihe, na-atụkwa anya na ha ga-akwụghachi ha. 35 Kama nke ahụ, unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ihe ọma. Na-agbazinyekwanụ ihe n’atụwaghị anya inweta ihe ọ bụla.+ Ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kacha Elu, n’ihi na obiọma ya na-erute ma ndị ọjọọ ma ndị na-anaghị ekele ndị meere ha ihe.+
-