-
Ọpụpụ 37:6-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 O ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ okwuchi ya.+ Ọ dị kubit abụọ na ọkara n’ogologo nakwa otu kubit na ọkara n’obosara.+ 7 O jikwa ọlaedo rụọ cherob abụọ.+ O ji hama kụọ ha. Ha dị na nsọtụ abụọ nke okwuchi igbe ahụ.+ 8 Otu cherob dị n’otu nsọtụ, cherob nke ọzọ adịrị na nsọtụ nke ọzọ. Ọ rụrụ cherob ndị ahụ na nsọtụ abụọ nke okwuchi igbe ahụ. 9 Cherob abụọ ndị ahụ chịliri nku ha abụọ elu, sachie okwuchi igbe ahụ.+ Ha chere ibe ha ihu, ihu ha kpudokwara n’okwuchi igbe ahụ.+
-