-
Ọpụpụ 36:8-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Ndị niile nwere nkà+ wee jiri ákwà ụlọikwuu iri rụọ ụlọikwuu ahụ.+ Ha ji ezigbo eri linin a kpara akpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie, kpaa ákwà ụlọikwuu ndị ahụ. Ọ* kpara ndị cherob na ha.+ 9 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ dị kubit* iri abụọ na asatọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu niile ahụ hà. 10 O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu ise nke ọzọ ọnụ. 11 O jizi eri na-acha anụnụ anụnụ dụnye oghere n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ise a dụkọtara ọnụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. O mere otu ihe ahụ n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà ya nke ikpeazụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. 12 Ọ dụnyere oghere iri ise n’otu ákwà ụlọikwuu, dụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ, ka oghere ndị ahụ chee ibe ha ihu. 13 N’ikpeazụ, o ji ọlaedo rụọ nko iri ise ma jiri nko ndị ahụ jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ, ya abụrụ otu ụlọikwuu.
-