-
Ọpụpụ 36:14-18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 O wee jiri ajị ewu kpaa ákwà ụlọikwuu a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ. Ọ kpara ákwà ụlọikwuu iri na otu.+ 15 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ dị kubit iri atọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu iri na otu ahụ hà. 16 O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu isii nke ọzọ ọnụ. 17 Ọ dụnyeziri oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ahụ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà ya nke ikpeazụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ. Ọ dụnyekwara oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a ga-ejikọta ya na ya. 18 O ji ọla kọpa rụọ nko iri ise a ga-eji jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ka ha bụrụ otu.
-