-
Ọpụpụ 36:20-23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 O jizi osisi akeshịa+ rụọ frem ndị kwụcha ọtọ a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ.+ 21 Frem nke ọ bụla dị kubit iri n’ogologo na otu kubit na ọkara n’obosara. 22 Frem nke ọ bụla nwere ụkwụ abụọ nọkọtara ọnụ n’okpuru ya. Otú ahụ ka o si rụọ frem niile a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ. 23 Ọ rụrụ frem ndị ga-adị n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ. Ha dị frem iri abụọ ndị chere ihu n’ebe ndịda.
-