-
Ọpụpụ 36:27-30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ọ rụrụ frem isii ndị ga-adị n’ebe azụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 28 Ọ rụrụ frem abụọ ndị ga-adị n’azụ ụlọikwuu ahụ n’isi ngwụcha ya abụọ. 29 A rụrụ ha ka ha gbaa mkpị si n’ala ruo n’elu, ruo n’ebe ihe nke mbụ dị okirikiri dị. Otú ahụ ka o si rụọ frem ndị ga-adị n’isi ngwụcha abụọ nke ụlọikwuu ahụ. 30 Ha wee dịrị frem asatọ nakwa ntọala iri na isii ha nwere oghere bụ́ ndị e ji ọlaọcha rụọ. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru frem nke ọ bụla.
-