Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọpụpụ 38:9-15
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 9 O wee rụọ ihe a ga-eji gbaa ụlọikwuu ahụ ogige.+ O ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ chere ihu n’ebe ndịda. Ha dị otu narị (100) kubit.+ 10 E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ ndị nwere oghere, jirikwa ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 11 Ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ugwu ya dị otu narị (100) kubit. E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ ha na ntọala iri abụọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 12 Ma ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ebe ọdịda anyanwụ ya dị kubit iri ise. Ogidi ha dị iri. Ntọala ha ndị nwere oghere dịkwa iri. E jikwa ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 13 Ma akụkụ ga-eche ebe ọwụwa anyanwụ ihu dị kubit iri ise. 14 Ákwà mgbochi ndị dị n’otu akụkụ ya dị kubit iri na ise. O nwere ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere. 15 Ákwà mgbochi ndị dị n’akụkụ ya nke ọzọ, n’ebe a ga-enwe ọnụ ụzọ e si abata n’ogige ahụ, dị kubit iri na ise. O nwere ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya