-
Ọpụpụ 38:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 E ji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ọ dị kubit iri abụọ n’ogologo, kubit ise n’ịdị elu, ya na ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ogige ahụ hà.+ 19 E ji ọla kọpa rụọ ogidi anọ ha na ntọala anọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha, jirikwa ọlaọcha machie elu ogidi ndị ahụ.
-