-
Levitikọs 24:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv a na-agwaghị agwa a ga-eji na-amụ ọkụ, ka ọkụ* ndị ahụ* wee na-enwu mgbe niile.+ 3 Erọn ga-ahụ na ọkụ ndị ahụ na-enwu, ya bụ, ọkụ ndị dị n’ihu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gechie igbe ọgbụgba ndụ* ahụ dị n’ụlọikwuu nzute. Ọkụ* ndị ahụ ga na-enwu malite ná mgbede ruo n’ụtụtụ n’ihu Jehova. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe.
-