-
Ọpụpụ 39:8-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 O wee kpaa akpa a na-anya n’obi.+ Ọ bụ onye na-akpa ihe n’ákwà kpara ya otú ahụ e si kpaa efọd ahụ. E ji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ya.+ 9 O nwere akụkụ anọ há nhata mgbe a pịajiri ya abụọ. Ha kpara akpa ahụ a na-anya n’obi ya adị otu ntụ ọbụ aka* n’ogologo nakwa n’obosara mgbe a pịajiri ya abụọ. 10 Ha tinyere ahịrị nkume anọ na ya. Ahịrị nke mbụ bụ rubi, topaz, na emerad. 11 Ahịrị nke abụọ bụ tọkwọiz, safaya, na jaspa. 12 Ahịrị nke atọ bụ nkume leshem,* aget, na ametist. 13 Ahịrị nke anọ bụ krisolaịt, ọnịks, na jed. A kwụnyere ha n’ihe mbadamba ndị e ji ọlaedo rụọ. 14 Nkume ndị ahụ dị ole aha ụmụ Izrel* dị, ya bụ, iri na abụọ. E denyere aha ha otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara. Aha nke ọ bụla nọchikwara anya otu ebo n’ime ebo iri na abụọ ahụ.
-