-
Levitikọs 1:4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ ahụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ. A ga-anabatakwa ya ka e jiri ya kpuchiere ya mmehie.
-
-
Levitikọs 8:18-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Ọ kpụtaziri ebule ahụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ebikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 19 Mosis wee gbuo ya ma fesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà. 20 E gburisịrị ebule ahụ. Mosis wee suo isi ya, akụkụ ya dị iche iche, na abụba* ya ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. 21 E ji mmiri saa eriri afọ ya na ụkwụ ya. Mosis wee suo ebule ahụ niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà e suru ọkụ ka o sie ísì ọma.* Ọ bụ àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
-