-
Ọpụpụ 37:25-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 O wee jiri osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà insens.+ O nwere akụkụ anọ há nhata. Ọ dị otu kubit n’ogologo, otu kubit n’obosara, na kubit abụọ n’ịdị elu. A rụkọtara ahụ́ ya na mpi ndị dị na ya ka ha bụrụ otu.+ 26 O ji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, ma elu ya ma akụkụ ya niile gbaa gburugburu ma mpi ndị dị na ya. O jikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya. 27 O ji ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri n’otu akụkụ ya nakwa n’akụkụ ya nke ọzọ, n’okpuru ihe ịchọ mma a kpụrụ n’ọnụ ya. Ha ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu ya. 28 O jizi osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma jiri ọlaedo machie ha.
-