-
Diuterọnọmi 4:15-18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 “N’ihi ya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ebe ọ bụ na e nweghị onye unu hụrụ n’ụbọchị ahụ Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu okwu na Horeb, 16 ka unu ghara imere onwe unu arụsị a pịrị apị nke yiri ihe ọ bụla, si otú ahụ merụọ onwe unu. Unu emela ihe ọ bụla yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+ 17 ihe yiri anụmanụ ọ bụla dị n’ụwa ma ọ bụ ihe yiri nnụnụ ọ bụla na-efe na mbara igwe,+ 18 ihe yiri ihe ọ bụla na-arịgharị n’ala ma ọ bụ ihe yiri azụ̀ ọ bụla dị na mmiri ndị dị n’ụwa.+
-