6 N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ, Jehova bụ́ Chineke unu ahọrọkwala unu ka unu bụrụ ndị ya, ndị pụrụ iche n’ime ndị niile nọ n’ụwa.+
4 ndị bụ́ ndị Izrel. Ọ bụ ha ka Chineke mere ka ha bụrụ ụmụ ya.+ E mere ka ha dị ebube, ha na ya gbakwara ndụ.+ Ọ bụ ha ka e nyere Iwu Mosis,+ nye ha ohere ije ozi dị nsọ,+ kwekwa ha nkwa dị iche iche.+