3Mosis bidoro ịzụrụ Jetro nna nwunye ya,+ bụ́ onye nchụàjà Midian, ìgwè ewu na atụrụ. Mgbe o du ìgwè ewu na atụrụ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ n’ala ịkpa, o rutere Horeb, bụ́ ugwu ezi Chineke.+
18 Mmadụ niile nọ na-anụ ụda égbè eluigwe na ụda opi, na-ahụkwa àmụ̀mà na-egbunụ na ugwu ahụ na-akwụ anwụrụ. Ihe ndị a ha hụrụ ma nụ ụda ha mere ka ha maa jijiji ma guzoro n’ebe dị anya.+