29 Ha na-enyekwara ha aka na-ahụ maka achịcha a na-enye Chineke,+ ntụ ọka e gwere nke ọma maka ịchụ àjà ọka, achịcha na-ekoghị eko dị fere fere,+ keeki e mere n’ite dị mbadamba, na ntụ ọka a gwọrọ agwọ.+ Ha na-enyekwa aka atụ̀ ihe niile a na-atụ atụ̀ iji mata ole ha dị na otú ha hà.