3 Ọ ga-eweta ụfọdụ n’ime àjà udo ahụ ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Jehova:+ abụba+ kpuchiri eriri afọ ya, abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya, 4 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+