-
Levitikọs 3:14-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Ihe ọ ga-eweta ka e jiri chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ bụ abụba kpuchiri eriri afọ anụ ahụ, abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya,+ 15 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ. 16 Onye nchụàjà ga-esu ha ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ ihe oriri.* Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esu ọkụ. Ọ bụ Jehova nwe abụba niile.+
-