-
Ọnụ Ọgụgụ 15:2-4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu mechara bata n’ala m na-enye unu ka unu biri na ya,+ 3 unu achọọ isi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* unu na-achụrụ Jehova,+ ma ọ̀ bụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ̀ bụ àjà mmadụ chọrọ iji mezuo nkwa pụrụ iche o kwere ma ọ̀ bụ onyinye si ya n’obi+ ọ chọrọ inye ma ọ bụ onyinye a na-enye n’oge ememme unu dị iche iche,+ 4 onye na-eweta onyinye ya ga-ewetakwara Jehova àjà ọka, ya bụ, otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma,+ nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ.
-