15 nwoke ahụ ga-akpọrọ nwunye ya kpọtara onye nchụàjà, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka bali ọ ga-enye maka nwunye ya. Ọ gaghị awụsa ya mmanụ ma ọ bụ tụkwasị ya frankinsens n’ihi na ọ bụ àjà ọka ekworo, àjà ọka nke na-eme ka e cheta onye ikpe mara.