3“‘Ọ bụrụ na àjà ọ chọrọ ịchụ bụ àjà udo,+ ọ bụrụkwa na ọ ga-esi n’ìgwè ehi weta anụ ọ ga-eji chụọ ya, ma ọ̀ bụ oké ma ọ̀ bụ nne, ọ bụ nke ahụ́ dị mma ka ọ ga-ewetara Jehova.
21 “‘Ọ bụrụ na mmadụ na-ewetara Jehova àjà udo+ ka o jiri ya mezuo nkwa o kwere ma ọ bụ ka ọ bụrụ onyinye si ya n’obi ọ na-enye Chineke, ọ ga-esi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ weta anụmanụ ahụ́ dị mma ka e wee nabata onyinye ya. Anụmanụ ahụ agaghị enwe nkwarụ ọ bụla.
16 Iko mmanya anyị na-ekele Chineke maka ya, ọ́ bụghị ọbara Kraịst ka ọ nọchiri anya ya?+ Achịcha ahụ anyị na-anyawa, ọ́ bụghịkwa ahụ́ Kraịst ka ọ nọchiri anya ya?+