36 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke ma dee ‘Jehova bụ Onye dị nsọ’ na ya. A ga-edenye ya otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+
30 N’ikpeazụ, ha ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke, bụ́ ihe àmà dị nsọ,* ma dee “Jehova bụ Onye dị nsọ” na ya, otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+