4 Ọ bụ anụmanụ ndị a ka unu nwere ike iri:+ ehi, atụrụ, ewu, 5 mgbada, anịgọ, mmoro, ewu ọhịa, ele, atụrụ ọhịa, na atụrụ na-ebi n’ugwu. 6 Unu nwere ike iri anụmanụ ọ bụla ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ nke na-atagharịkwa ọnụ.
14 Ma m sịrị: “Mbanụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Kemgbe m bụ nwata ruo ugbu a, eritụbeghị m* anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ anụ a dọgburu adọgbu,+ ihe ọ ga-abụ m mee, mụ emerụọ onwe m. Anụ rụrụ arụ abatụbeghịkwa m n’ọnụ.”+