-
Levitikọs 5:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa*+ ntụ ọka e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie ya. Ọ gaghị awụ mmanụ n’elu ya ma ọ bụ tụkwasị frankinsens n’elu ya n’ihi na ọ bụ àjà mmehie. 12 Ọ ga-ewetara ya onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka ga-eju ọbụ aka ya ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà o wetara, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu àjà Jehova e suru ọkụ. Ọ bụ àjà mmehie.
-
-
Levitikọs 6:14, 15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà ọka:+ Ọ bụ ụmụ Erọn ndị nwoke ga na-eweta ya n’ihu Jehova, n’ihu ebe ịchụàjà. 15 Otu n’ime ha ga-esi n’ọka ahụ e gwere nke ọma e ji achụ àjà ọka kporo ntụ ọka ga-eju ọbụ aka ya, ya na mmanụ ya na frankinsens niile a tụkwasịrị n’elu ya. Ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Ọ bụ ya nọchiri anya àjà ọka e wetara.+
-