22 M ga-apụta n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu okwuchi igbe ahụ+ gwa gị okwu. M ga-esi n’agbata cherob abụọ ahụ dị n’elu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ mee ka ị mara ihe niile m ga-enye gị n’iwu ka ị gwa ndị Izrel.
15 Hezekaya malitekwara ikpe ekpere+ gwa Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob,+ naanị gị bụ ezi Chineke nke alaeze niile dị n’ụwa.+ Ọ bụ gị kere eluigwe na ụwa.