-
Levitikọs 7:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ma ihe ọ bụla fọrọ n’anụ ahụ a chụrụ n’àjà ruo n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.+ 18 Ma ọ bụrụ na e rie ihe ọ bụla fọrọ n’anụ e ji chụọ àjà udo n’ụbọchị nke atọ, Chineke agaghị anabata onye wetara àjà ahụ. Àjà ahụ agaghị abara ya uru. Ọ bụ ihe rụrụ arụ. Onye* riri nke ọ bụla n’ime ya ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.+
-