3 Unu akpala àgwà otú ndị Ijipt unu biri n’ala ha na-akpa. Unu emekwala ihe ndị bi na Kenan, bụ́ ebe m na-akpọga unu, na-eme.+ Unu esokwala omenala ha.
24 “‘Unu emela nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ka unu ghara ịbụ ndị na-adịghị ọcha, n’ihi na ọ bụ ihe ndị a niile ka mba ndị m na-achụpụrụ unu nọ na-eme wee bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+
30 Ma mgbe o bibichara ha, kpacharanụ anya ka unu ghara ime ihe ndị ha mere. Unu ajụla ase gbasara chi ha, sị, ‘Olee otú mba ndị a si fee chi ha dị iche iche? Anyị ga-emekwa ka ha.’+