11 Ọ bụrụ na ọ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha,+ nke a na-agaghị ejili chụọrọ Jehova àjà, ọ ga-akpụta anụ ahụ ma kwụwa ya n’ihu onye nchụàjà. 12 Onye nchụàjà ga-ekwu ego ole a ga-akwụ n’isi ya. Ọ bụ otú anụmanụ ahụ dị ka ọ ga-eji kpebie ya. Ego ole ọ bụla onye nchụàjà kwuru ka ọ ga-abụ.