10 Unu ga-edo afọ nke iri ise nsọ ma maa ọkwa ka ndị niile bi n’ala unu nwere onwe ha.+ Ọ ga-abụrụ unu afọ Nnwere Onwe.* Onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala o ketara. Onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.+
28 “‘Ma ọ bụrụ na o nwetaghị ego ọ ga-eji zụrụghachi ya n’aka onye o resịrị ya, ihe ahụ o rere ga-adị n’aka onye zụrụ ya ruo n’afọ Nnwere Onwe.+ Ala ahụ ga-abụghachi nke ya n’afọ Nnwere Onwe, ya ewerezie ya.+