17 A ga-ebibi obodo a na ihe niile dị n’ime ya.+ Ha niile bụ nke Jehova. Naanị Rehab+ nwaanyị akwụna ahụ ga-adị ndụ, ya na ndị niile ya na ha nọ n’ụlọ, n’ihi na o zoro ndị anyị dunyere ozi.+
3 Gaa gbuo ndị Amalek,+ laakwa ha na ihe niile ha nwere n’iyi.+ Ahapụkwala ha ndụ.* Gbuo ha niile,+ ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa ọhụrụ, ma ehi ma atụrụ, ma kamel ma jakị.’”+