39 Chụọ otu ebule n’àjà n’ụtụtụ, chụọkwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede.+ 40 Ihe ndị ị ga-eji chụọ ebule nke mbụ n’àjà bụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanụ oliv, nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya nke ga-abụ àjà mmanya.