-
Ọnụ Ọgụgụ 28:11-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘Ná mbido ọnwa ọ bụla,* unu ga-eji oké ehi abụọ, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ 12 nakwa ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka+ maka oké ehi nke ọ bụla, nakwa ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka maka otu ebule ahụ,+ 13 nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka maka nwa ebule nke ọ bụla. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma*+ a na-esu ọkụ, àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.
-