-
Ọnụ Ọgụgụ 25:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Mgbe Finihas+ nwa Elieza nwa Erọn onye nchụàjà hụrụ ya, o si n’ebe ahụ ndị Izrel zukọrọ bilie ozugbo ma were ube. 8 O sochiri nwoke Izrel ahụ azụ ma banye n’ụlọikwuu ha banyere, magbuo ha abụọ. Ọ mabara nwoke Izrel ahụ na nwaanyị ahụ ube n’ahụ́, ube ahụ amaba n’ihe nke nwaanyị ahụ ji bụrụ nwaanyị. Ọrịa ọjọọ nọ na-egbu ndị Izrel wee kwụsị.+
-