-
Ọpụpụ 26:32Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
32 Ị ga-ekonye ya n’ogidi anọ e ji osisi akeshịa rụọ bụ́ ndị e ji ọlaedo machie. A ga-eji ọlaedo rụọ ihe e ji ekonye ha. A ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ntọala anọ nwere oghere ndị e ji ọlaọcha rụọ.
-
-
Ọpụpụ 36:37, 38Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
37 O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.+ 38 Ọ rụkwara ogidi ise ya na ihe a ga-eji ekonye ihe na ha. O ji ọlaedo machie elu ha nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. Ma, ọ bụ ọla kọpa ka e ji rụọ ntọala ise ha ndị nwere oghere.
-