17 Chineke nụrụ olu Lia ma za ya. O wee dị ime, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke ise. 18 Lia wee sị: “Chineke akwụọla m ụgwọ ọrụ m* maka na m kpọnyere di m nwaanyị na-ejere m ozi.” O wee gụọ ya Ịsaka.*+
5 Ndị ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Juda bụ ebo Ịsaka. Onyeisi ụmụ Ịsaka bụ Netanel+ nwa Zua. 6 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na anọ na narị anọ (54,400).+