16“Na-echetanụ ọnwa Ebib,* na-emekwaranụ Jehova bụ́ Chineke unu Ememme Ngabiga+ na ya, n’ihi na ọ bụ n’ọnwa Ebib ka Jehova bụ́ Chineke unu kpọpụtara unu n’Ijipt, n’abalị.+
7 Wepụnụ ihe ahụ na-eko achịcha, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta, n’ihi na unu dị ka ntụ ọka a na-etinyeghị ihe na-eko achịcha. N’eziokwu, Kraịst ejirila ndụ ya chụọ àjà,+ si otú ahụ bụrụ nwa atụrụ anyị ji mee Ememme Ngabiga.+