2 Ndị Eze 18:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 N’afọ nke atọ n’ọchịchị Hoshia+ nwa Ịla eze Izrel, Hezekaya+ nwa Ehaz+ eze Juda malitere ịchị. 2 Ndị Eze 18:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 Ọ bụ ya wepụrụ ebe ndị dị elu,+ kụrisịa ogidi arụsị, gbutusịakwa ogwe osisi arụsị.*+ Ọ kụrisịkwara agwọ ọla kọpa Mosis kpụrụ,+ n’ihi na tupu mgbe ahụ, ndị Izrel nọ na-achụrụ ya àjà a na-esu ọkụ. Ha nọkwa na-akpọ ya arụsị agwọ ọla kọpa.*
4 Ọ bụ ya wepụrụ ebe ndị dị elu,+ kụrisịa ogidi arụsị, gbutusịakwa ogwe osisi arụsị.*+ Ọ kụrisịkwara agwọ ọla kọpa Mosis kpụrụ,+ n’ihi na tupu mgbe ahụ, ndị Izrel nọ na-achụrụ ya àjà a na-esu ọkụ. Ha nọkwa na-akpọ ya arụsị agwọ ọla kọpa.*