-
Diuterọnọmi 2:26-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 “M wee si n’ala ịkpa Kedemọt+ zigara Eze Saịhọn onye na-achị Heshbọn ndị ozi ka ha gwa ya okwu ga-eme ka anyị na ya dịrị n’udo.+ M sịrị ya, 27 ‘Ka anyị si n’ala gị gafere. Ọ bụ n’okporo ụzọ ka anyị ga-aga. Anyị agaghị abanye n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+ 28 Ọ bụ naanị nri ị ga-eresị anyị ka anyị ga-eri, ọ bụkwa naanị mmiri ị ga-eresị anyị ka anyị ga-aṅụ. Naanị ihe anyị chọrọ bụ ka i kwe ka anyị jiri ụkwụ gafere.
-