21 Jehova bụ́ Chineke Izrel wee nyefee Saịhọn na ndị ya niile n’aka Izrel, ha wee merie ha. Izrel weghakwaara ala ndị Amọraịt niile, bụ́ ndị bi n’ala ahụ.+ 22 Ha wee weghara ala ndị Amọraịt niile malite na mmiri Anọn ruo na mmiri Jabọk, malitekwa n’ala ịkpa ruo n’Osimiri Jọdan.+