-
Joshụa 13:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Ọkara ebo Manase nke ọzọ na ebo Ruben nakwa ebo Gad ketara ala Mosis nyere ha n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Ebe ahụ ka Mosis ohu Jehova nyere ha.+ 9 O nyere ha malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn,+ na obodo dị n’etiti ndagwurugwu ahụ, na ala Medeba niile nke dị larịị, ruokwa Daịbọn.
-