-
Ọnụ Ọgụgụ 22:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 O zigaara Belam nwa Biọ, onye bi n’ebe a mụrụ ya na Pitọ,+ ndị ozi. Pitọ dị n’akụkụ Osimiri Yufretis.* Ọ gwara Belam ka ọ bịakwute ya, sị: “E nwere ndị si n’Ijipt pụta. Ha ejula ụwa.+ Ha nọkwa ezigbo nso n’ala m. 6 Biko, bịa bụọrọ m ha ọnụ+ n’ihi na ha ka m ike. Ikekwe, m ga-emerili ha ma chụpụ ha n’ala a, n’ihi na o doro m anya na onye ị gọziri bụ onye a gọziri agọzi, onye ị bụrụ ọnụ bụkwa onye a bụrụ ọnụ.”
-