2 Juda hụrụ nwa nwaanyị otu nwoke Kenan+ n’ebe ahụ. Aha nwoke ahụ bụ Shua. Juda wee lụọ nwa ya nwaanyị ahụ, ya na ya enwee mmekọahụ. 3 Nwaanyị ahụ wee dị ime, mechaa mụọ nwa nwoke. Juda wee gụọ ya Ea.+ 4 Ọ dịkwara ime ọzọ ma mụọ nwa nwoke wee gụọ ya Onan.