18 Unu abịaghị nso n’ihe e nwere ike imetụ aka,+ nke ọkụ na-ere na ya,+ nke ígwé ojii na oké ọchịchịrị kpuchiri, nke oké ifufe na-efekwa na ya,+ 19 nke ụda opi si na ya na-ada,+ a na-anụkwa olu si na ya na-ekwu okwu.+ Mgbe ndị Izrel nụrụ olu a, ha rịọrọ ka a ghara ịgwa ha okwu ọ bụla ọzọ.+