19 Amarala m ya, amakwa m na ọ ga-enye ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya niile iwu ka ha na-eme ihe Jehova kwuru ma na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi,+ ka Jehova wee meere Ebreham ihe o kwere ya ná nkwa.”
9 “Lezienụ anya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ka unu ghara ichefu ihe ndị anya unu hụrụ, ka ha gharakwa ịpụ apụ n’obi unu n’oge niile unu dị ndụ. Unu ga-emekwa ka ụmụ unu na ụmụ ụmụ unu mara ha.+