-
Ndị Ikpe 11:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Izrel wee zigara eze Ịdọm+ ndị ozi, sị ya: “Biko, ka anyị si n’ala gị gafere,” ma eze Ịdọm egeghị ha ntị. Ha zigakwaara eze Moab+ ozi, ma o kweghị. Izrel wee nọrọzie na Kedesh.+ 18 Mgbe ha si n’ala ịkpa na-aga, ha abanyeghị n’ala Ịdọm+ nakwa n’ala Moab. Ha si n’ebe ọwụwa anyanwụ Moab+ gafere ma maa ụlọikwuu n’ofe mmiri Anọn. Ha abanyeghị n’ala Moab, maka na mmiri Anọn bụ ókè nke ala Moab.+
-