39 Aịzik nna ya sịziri ya:
“Lee, ị ga-ebi n’ala na-anaghị eme nri, igirigi nke eluigwe agaghịkwa na-adara gị.+ 40 Ị ga na-ebu mma agha gị n’oge niile ị nọ ndụ,+ ị ga-ejekwara nwanne gị nwoke ozi.+ Ma, mgbe ọ na-ekweghịzi gị odidi, ị ga-akwụsị ịgbara ya ohu.”+