Diuterọnọmi 25:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Ọ bụrụ na e kwesịrị ịpịa onye nke mere ihe na-adịghị mma ihe,+ onyeikpe ga-eme ka o dinara ala, a ga-anọkwa n’ihu onyeikpe ahụ pịa ya ihe. Ihe a ga-eji mara ọnụ ụtarị ole a ga-apịa ya bụ otú ihe o mere dịruru njọ. Ilu 10:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Ihe onye na-aghọta ihe na-ekwu na-egosi na ọ ma ihe,+Ma e mere ụtarị maka azụ onye na-enweghị uche.+ Ilu 19:29 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 29 A ga-ekpe ndị na-akwa emo ikpe,+A ga na-etikwa ndị nzuzu ihe n’azụ.+
2 Ọ bụrụ na e kwesịrị ịpịa onye nke mere ihe na-adịghị mma ihe,+ onyeikpe ga-eme ka o dinara ala, a ga-anọkwa n’ihu onyeikpe ahụ pịa ya ihe. Ihe a ga-eji mara ọnụ ụtarị ole a ga-apịa ya bụ otú ihe o mere dịruru njọ.
13 Ihe onye na-aghọta ihe na-ekwu na-egosi na ọ ma ihe,+Ma e mere ụtarị maka azụ onye na-enweghị uche.+