Levitikọs 26:3, 4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 “‘Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru, na-edebe ihe m nyere n’iwu ma na-eso ha,+ 4 m ga-eme ka mmiri na-ezoro unu n’oge kwesịrị ekwesị.+ Ala ga na-amị mkpụrụ ya.+ Osisi ndị dị n’ubi ga na-amịkwa mkpụrụ ha. Ilu 10:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya,+E nweghịkwa nsogbu* ya na ya na-eso. Aịzaya 1:19 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 19 Ọ bụrụ na unu ekwe gee ntị,Unu ga-eri ọmarịcha ihe ndị dị n’ala a.+
3 “‘Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru, na-edebe ihe m nyere n’iwu ma na-eso ha,+ 4 m ga-eme ka mmiri na-ezoro unu n’oge kwesịrị ekwesị.+ Ala ga na-amị mkpụrụ ya.+ Osisi ndị dị n’ubi ga na-amịkwa mkpụrụ ha.