13 Ọ ga-ahụ unu n’anya, gọzie unu ma mee ka unu mụbaa. Ọ ga-eme ka unu mụta ọtụtụ ụmụ.+ Ọ ga-agọzikwa ihe unu kụrụ n’ala unu, ọka unu, mmanya ọhụrụ unu, mmanụ unu,+ ụmụ ehi unu na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ unu, n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu.+